UMI
EDEMEDE
Asusu obula di n’uwa nwere olundi e jiri mara ya. Asusu Igbo, dika otu
n’ime asusu ato e nwere na Naijiria nwere olundi di iche iche ma nwekwaa Igbo
Izugbe e jiri mara obodo niile na-asu asusu Igbo. N’edemede nchocha a nke isi
okwu ya bu Ntulerikota olundi Achi na nke Igbo Izugbe, e lebara anya n’olundi
Achi iji choputa myiri na ndiiche di n’etiti ya na Igbo Izugbe. Nwanchocha
malitere site n’inye nkowa banyere ebe isiokwu a gbadoro ukwu. E nyere nkowa
banyere olundi na Igbo Izugbe putara. A kowakwara abumnobi nchocha a nke
gunyere ikwalite asusu Igbo. E metutakwara aka n’uru di iche iche nchocha a
baara nwanchocha, umuakwukwo, ndinkuzi ndi ga-agu ya n’odinihu na ndi ga-eme
nchocha nay a tinyere ndi nwere mmasi n’asusu Igbo. Nihi na nchocha nke e mere
bu nke sovee, nwanchocha gara n’ogbe iri na abuo di n’Achi gbaa ndi okenye
ajuju onu. E kere ndi maara aguede akwukwo ajuju nke ha zakwara. A kowakwara
maka okere nchocha ebe a noro kowaputa na o bu naani Igbo a suru asu ka
agbadokariri ukwu ihi choputa ihe digasi mkpa banyere olundi
Achi. E deputakwara ajuju niile a juru ndi e jiri mee nchocha kesaa ha nye ndi
nwere ike igu ha dika nid nkuzi na umuakwukwo. E ziputakwara otutu nnyocha ihe
e derela banyere isiokwu nakwa nnyocha edemede nchoputa bu ndi e sitere
n’akwukwo agumagu di iche iche e biputara ebiputa nwetasia nwanchocha lebakwara
anya n’ihe gbasara usoro nchocha e mere bu ebe o noro wee rutu aka n’ihe e
banyere udidi nchocha ebe ndi a noro mee chocha, ndi e jiri mee nchocha, nsere
na usoro nsere nchocha, ngwa oru di iche iche e jiri mee nchocha. E tuchara ihe
niile a choputara banyere olundi Achi ma tulerikota ya na Igbo Izugbe. Nwanchocha
mechara chikota ihe niile o mere na nchocha a, tunyekwuo aro eti a ga-esi site
n’ileba anya n’olundi di iche iche e nwere n’asusu Igbo mee ka asusu Igbo were
onodu ua dike asusu tozuru etozu.
ISI NKE MBU
1.0 OKWU MMALITE
N’elu uwa dum mmadu bi, obodo obula nwere
olundi e ji mara ya. O bu nihi nke a ka eji esite n’asusu mmadu mara obodo onye
ahu si. Asusu bu ihe mmadu ji akowaputa echiche ya, o bukwa asusu ka mmadu na
ibe ya ji enwe mmekorita nke ikwurita okwu. Anumanu enweghi asusu, o bu naani
mmadu bu anu nwere asusu puru iche o ji enwe mmekorita n’etiti ya na ibe ya.
Crystal (1971) kowara asusu dika udaolu
mmadu a haziri ahazi n’udi nke na-abughi ebumputa uwa mmadu n’onwe ya mebere e
ji akowaputa echiche site n’okwu onu ma obu ederede. Nkowa nke a gosiputara na
o bu mkpa mmadu nwere ime ka a mara ihe o bu n’obi kpalitere asusu. Nchoputa a
choputara gosiri na e nwere ihe kariri nari asusu abuo na iri ise n’ime obodo
anyi bu Naijiria. Asusu ndi putakariri ihe bu Igbo, Hausa na Yoruba. Asusu
na-enwe olumba na olu onye nke a bu out njirimara asusu. Asusu Igbo nwere otutu olumba mejuputara ya nke ndi okammuta
ufodu dika Ikekonwu (1985) kwuru na ekeree ya uzo isii, ka e si asu ya na obodo
ebe na-asu ya gunyere;
1.
Igbo ndi owuwa anyanwu Naija
2.
Igbo ndi odida anyanwu Naija
3.
Olundi mgbago ugwu
4.
Igbo Nnon’etiti
5.
Igbo Cross River
6.
Olundi Ohaji/Eghema
Igbo Izugbe, dika e si ahuta ya; Anozie
(1999) kwuru na e nwere ike iwere otu asusu kwuuru onwe ya maobu otu n’ime
olumba mebere asusu obula jiri ya mebe Igbo Izugbe. Ihe di mkpa bu ileba anya
were asusu maobu olundi nke mmadu niile nwere nmasi nay a jiri ya mere asusu
izugbe. Nkowa nke a gosiri na o bu site n’olundi di iche iche ka e si achikoba
ya. Nke a gosiri n o bu ihe di ezigbo mkpa ileba anya n’olu ndi iche iche iche
mebere asusu Igbo ka wee site na ha mee ka asusu Igbo na-eto eto etu okwesiri.
O bu nkw a so n’ihe kpaliri mmuo nwanchocha ime nchocha
banyere olundi obodo ya bu Achi site n’itulerikota ya na Igbo Izugbe.
1.1 MGBAKWASA ISIOKWU
Asusu Igbo bu otu n’ime asusu ato kacha puta ihe na Naijiria ma burukwa
otu n’ime asusu e ji eme nchocha n’ogo di elu. Nihi ya ka o ji di ezigbo mkpa
ileba anya n’isi okwu nchocha a bu Nkulerikota olundi Achi na Igbo Izugbe.
Otutu mgbanwe adila n’ebe asusu Igbo di
nihi obibia nke uka na agumakwukwo nke ndi ocha biara n’ala Igbo wetara. O bu
ihe doro anya na asusu bu otu n’ime omenala e ji amata agburu obula, mana a bia
n’obodo anyi bu Naijiria taa, a ga-achoputa na oke agumakwukwo na mmepe di iche
iche e meela ka agburu ufodu tumadu agburu Igbo na-eleda asusu ha anya ma nwee
oke mmasi n’iwelite asusu agburu ndi ozo okasi asusu Bekee. O bughi naani na
Igbo Izugbe na-alaghachi azu, kama nke jogburu onwe ya bu na mperimpe asusu di
iche iche olundi mejuputara Igbo Izugbe na-anwuzi anwu. Ekele diri otu iwelite
asusu na omenala ndi Igbo (SPILC) bu otu gbadosiri ukwu ike n’ala si
na asusu Igbo agaghi ada n’ala ma obu nwuo anwu.
Emenchocha a gbodoro ukwu na mkpu ndi huru
asusu Igbo n’anya, na’eti wee leba anya n’olu ndi Achi ka otu n’ime olundi di
iche iche mejuputara Igbo izugbe iji chetara umu Igbo na o ga-abu nnukwu ihe
nwute ma a hapu asusu Igbo ka nwuo pii. Olundi obula bu onyinye puru iche
Chineke nyere ha iji nwee mmekorita n’etiti ha na ibe ha, o buy a mere
nwanchocha jiri huta ya dika ihe bara uru ma dikwa oke mkpa ileba any n’olundi
obodo ya.
1.2 NSOGBU NCHOCHA
O nwere nsogbu di iche iche a choputara
n’emenchocha a. nwanchocha choputara na otutu ndi Achi anaghizi enwe mmasi
n’isu asusu Achi. Otutu n’ime ha amaghi ka e si asu asusu ahu ma ncha, nihi oke
apumije na mmepe. Nke a mere ka asusu Achi na-alaghachi azu.
Nsogbu ozo bun a mgbanwe di iche iche
na-abata n’agumakwukwo nke mere na a na-ele onye a maghi asu asusu
Bekee dika onye amaghi akwukwo, nke a mere
ka nne na nna bu ndi kwesiri iji olundi zulite umu ha na-agba nnukwu mbo iji
asusu Bekee wee tooro umu ha nto ala asusu ngwa ngwa ha malitere ikwu okwu.
Onodu a nyere nsogbu nke ukwu maka na o na-eme ka asusu Achi di ka asusu na-abaghi
I’ihe.
Nsogbu ozo enwere bu n’ichota ndi okenye
maara maka asusu Achi nkeoma. Otutu n’ime ndi okenye anwuola, ndi foduru afodu,
nghota anaghi adizi n’okwu ha nihi na ha akaala nka nka ukwu. Ozo bun a
ngwakorita olu ndi Achi na olundi ndi ozo ha na ha gbara agbata obi, nke a mere
ka ndi nke kana asu asusu Achi ghara idi na-asu asusu ahu kpomkwem.
Nke ozo bun a e nweghi akwukwo e dere
banyere olundi di iche iche e nwere n’asusu Igbo tinyekwara na asusu bu ihe
omimi ma sikwaa ike na ntule nke mere na e mebeghi otutu nchocha banyere olumba
Achi.
Nsogbu ozo bun a ihere na-eme umu akwukwo
obuladi ndi nkuzi bu ndi Achi iziputa ihe ha bu n’obi mgbe ha na-aza ajuju a
juru ha. Ufodu ndi a gbara ajuju onu
eweputachaghi ihe a turu anya n’ihi na ihere isuputa olundi Achi na-eme ha.
1.3 EBUMNUCHE NCHOCHA
O na-enwe ihe mmadu bu n’uche mgbe obula o
na-amalite ime ihe; nihi ya nwanchocha nwere ihe kpaliri mmuo ya ime nchocha
n’isiokwu a bu Ntulerikota olundi Achi na Igbo Izugbe. Nwanchocha choputara na
e mebeghi nchocha n’olundi Achi n’uzo putara ihe nke oma. O bu ya mere na ihe
mbu bu ebumnobi nchocha a bu ileba anya n’olundi Achi. Ebumnobi na-aga esite
n’udi nchocha a wee mee ka nwa afo Igbo obula, tumadu ndi Achi mara na olundi
ha bu onyinye amara Chukwu nyere ha nke kwesiri ka ha jidesie ike.
Ebumnobi ozo e jiri mee nchocha a bu ka e
site nay a nye aka iwelite asusu na omenala Igbo maka na o bu ihe ifufe isi na
ndi Igbo na-ahapuzi ihe a kuru na-agba ihe ozo n’ihe gbasara isu asusu ha. O
bughi naani na nwanchocha choro isite na nchocha nke a mee ka a mata ileda
asusu Igbo anya ma sitekwa n’uzo di otu a welite asusu Igbo site n’ituputa ihe
ndi di mkpa n’olundi Achi ga-enyere Igbo izugbe
aka iji na-eto eto.
1.4 URU NCHOCHA
A bara n’ime nchocha a nke isiokwu ya bu
Ntulerikota olundi Achi na Igbo Izugbe. Nihi olile anya e nwere na o ga-abara
ohanaeze uru. Ufodu n’ime uru ndia bu na –
1.
O ga-enyere umuakwukwo na-amu maka asusu aka ighota
ihe bu olundi na Igbo izugbe na imata myiri na ndiche din a ha.
2.
Ndi nkuzi ga-eritekwa uru na nchocha a nihi na
o ga-eme ka mmuta ha nwere bawanye uba n’ebe olundi na Igbo izugbe di.
3.
Ihe mmuta sitere na nchocha a ga-emekwa ka oha
na eze tumadu ndi Achi ghota na asusu ha bara uru ma burukwa nke na-ekwesighi
ka o na-eme ha ihere.
4.
Nchocha a bara uru nye ndi ozo ga-eme nchocha
n’udi isiokwu a n’odinihu.
5.
Nchocha a ga-eme ndi mmadu ghota na asusu bu
ihe di mkpa ma burukwa ihe kwesiri ka e chekwaa ka ogbo ndi na-eso na’azu wee
nwee mmasi ijidesi ya ike.
O bu eziokwu na olundi Igbo
abughi otu ma o bu otu ihe ka ha na ekwu. N’edemede nchocha a, a ga-eleba anya n’ihe
banyere olundi Achi na ntulerikota ya na Igbo
izugbe. Ihe ozo a ga-eleba anya bu bu usoro
odidiudasusu mkpurudasusu, usoromkpoputa
na-abata n’olundi Achi nke puru iche
n’igbo izugbe.
AJUJU NCHOCHA
1.
E nwere mmetuta n’etiti olundi Achi na nke Igbo
Izugbe?
2.
E nwere myiri ma obu ndiche n’etiti
mkpurudasusu Achi na nke Igbo Izugbe?
3.
Olee ihe mere mkpoputa mkpurudaasusu ndi Achi
ufodu na nke Igbo Izugbe jiri di iche?
4.
Olee ebe usorodidiudaasusu Achi na nke Igbo
Izugbe yiri na ebe ha di iche?
5.
Gini mere asusu ndi Achi ji enye otutu ndi
ntorobia nsogbu osusu?
6.
O nwere mgbochiume di n’olundi Achi nke
na-adighi n’Igbo Izugbe?
7.
Olee ntuputa olundi Achi mere ga-abara Igbo
Izugbe uru?
================================================================
Item Type: Project Material | Size: 58 pages | Chapters: 1-5
Format: MS Word | Delivery: Within 30Mins.
================================================================
No comments:
Post a Comment
Note: Only a member of this blog may post a comment.